Psalms 62

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ Ọma Devid.

Ịnọgide nʼokwukwe

1Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike.
Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa.
2Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m;
ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.

3Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a?
Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya,
ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo?
4Ha ekpebiela
isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya;
okwu ụgha na-atọ ha ụtọ.
Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi,
ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. Sela

5O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke;
olileanya m na-esite na ya na-abịa.
6Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m.
Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.
7Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke,
Maọbụ, Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ nzọpụta m na ugwu m

Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m.
8Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ;
kwupụtaranụ ya obi unu,
nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela

9Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume,
ndị ukwu bụ naanị ụgha;
ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu;
ha niile bụ naanị otu nkuume.
10Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego,
maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu;
akụ unu nwere ike mụbaa,
unu atụkwasịla ha obi.

11Chineke ekwuola otu ihe,
ihe abụọ ka m nụrụ:
“Na gị, O Chineke, dị ike,
12na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya.
Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụla
dịka ọrụ ya si dị.”
Copyright information for IboBIU